Psalms 150

Ka ihe niile too Onyenwe anyị

1Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.
Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
2Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.
Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
3Werenụ opi ike too ya,
werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
4jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,
jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
5werenụ ogene too ya,
werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.

6Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị.
Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.

Copyright information for IboBIU